Ọnu-Ọgugu 15:23-37 Bible Nso (IGBOB)

23. bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu;

24. ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie.

25. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha:

26. agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha; n'ihi na n'ebe ndi Israel nile nọ emere ya n'amaghi-ama.

27. Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie.

28. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya.

29. Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.

30. Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya.

31. N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.

32. Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike.

33. Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile.

34. Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya.

35. Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

36. Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu.

37. Jehova we gwa Moses okwu, si,

Ọnu-Ọgugu 15