Ọnu-Ọgugu 14:39-44 Bible Nso (IGBOB)

39. Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku.

40. Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo.

41. Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.

42. Unu arigola, n'ihi na Jehova anọghi n'etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.

43. N'ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n'ebe ahu n'iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n'ihi na unu esiwo n'iso Jehova laghachi, n'ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu.

44. Ma ha were npako rigorue elu ugwu ahu: ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na Moses, esighi n'etiti ọmuma-ulo-ikwū pua.

Ọnu-Ọgugu 14