1. Nzukọ Israel nile we welie olu-ha, tie nkpu; ndi Israel we kwa ákwá abali ahu.
2. Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n'ala Ijipt, ma-ọbu n'ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo!
3. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt?
4. Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n'Ijipt.
5. Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel.
6. Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha:
7. ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku.
8. Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
9. Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.