11. O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.
12. Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.
13. Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
14. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
15. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.
16. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.
17. Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.
18. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
19. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.
20. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.
21. Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.
22. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
23. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.
24. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni.