4. Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke.
5. Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi.
6. Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme.
7. N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ.
8. Oké ọṅù we di n'obodo ahu.
9. Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:
10. onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku.
11. Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya.