7. Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a.
8. O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.
9. Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,
10. weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.
11. Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ.
12. Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n'Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu.
13. Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero.
14. Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise.
15. Jekob we ridata n'Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà;
16. ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem.
17. Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt,
18. rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef.
19. Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.