Ọlu Ndi-Ozi 7:21-26 Bible Nso (IGBOB)

21. ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere.

22. Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile.

23. Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya.

24. Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt:

25. ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi.

26. N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu?

Ọlu Ndi-Ozi 7