Ọlu Ndi-Ozi 7:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt,

18. rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef.

19. Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.

20. N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya:

21. ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere.

22. Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile.

23. Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya.

24. Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt:

25. ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi.

26. N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu?

27. Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ?

Ọlu Ndi-Ozi 7