Ọlu Ndi-Ozi 4:21-26 Bible Nso (IGBOB)

21. Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.

22. N'ihi na nwoke a b͕ara kari ọgu arọ abua, bú onye emereri ihe-iriba-ama nka n'aru-ya, bú ime ka aru-ya di ike.

23. Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri.

24. Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

25. Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si,N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu,Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?

26. Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù,Ndi-isi zukọ-kwa-ra,Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:

Ọlu Ndi-Ozi 4