1. Mb͕e azọputasiri ayi, mb͕e ahu ayi matara na anākpọ agwe-etiti ahu Melita.
2. Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi.
3. Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n'ọku, aju-ala we si n'okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n'aka.