Ọlu Ndi-Ozi 27:40-43 Bible Nso (IGBOB)

40. Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú.

41. Ma ebe ha dabàra n'otù ebe di n'ab͕ata oké osimiri abua, ha we tiye ub͕ọ n'ala; ọnu-ub͕ọ we siri n'ala digide kwa nēnweghi ike ka eropu ya, ma ike ebili-miri nyajibere isi-ub͕ọ.

42. Ma ọdú ndi-agha duru bu ka ha b͕ue ndi-nkpọrọ, ka onye ọ bula nime ha ghara isi n'ub͕ọ gwu miri, we b͕alaga.

43. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n'ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n'ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala:

Ọlu Ndi-Ozi 27