24. si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.
25. N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom.
26. Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti.
27. Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso;
28. ha we tù oké osimiri, hu na ọ bu orú mbudu: mb͕e oge ntà gasiri, ha we tù ọzọ, hu mbudu iri na ise.
29. Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n'ala nkume, ha we rada arilika anọ n'isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ.
30. Mb͕e ndi-ub͕ọ nāchọ uzọ isi n'ub͕ọ b͕apu, mb͕e ha wedasi-kwa-ra ub͕ọ ntà n'oké osimiri, nēme dika ha gaje iseti arilika n'ọnu-ub͕ọ,
31. Pọl we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise na ndi-agha, Ọ buru na ndia anọgideghi n'ub͕ọ, apughi izọputa unu onwe-unu.
32. Mb͕e ahu ndi-agha bipuru udọ̀ ub͕ọ ntà ahu, we rapu ya ka ọ dapu.
33. Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n'ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe.
34. N'ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n'ihi na nka diri nzọputa-unu: n'ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n'isi onye ọ bula n'etiti unu la n'iyì.
35. Mb͕e o kwusiri ihe ndia, nara kwa achicha, ọ kele Chineke n'iru madu nile: we nyawa ya, malite kwa iri ya.
36. Ha nile we nwe obi-utọ, ha onwe-ha we ri kwa nri.
37. Ayi nile ndi nọ n'ub͕ọ di ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na isi.
38. Mb͕e ha rijusiri afọ, ha me ka ub͕ọ di nfé, site n'itufu ọka n'oké osimiri.
39. Ma mb͕e chi bọrọ, ha amataghi ala ahu: ma ha huru otù ọnu-miri nke nwere ótú, ha we b͕a ìzù ma ha puru ime ka miri nubà ub͕ọ n'ala.
40. Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú.