17. mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n'okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a.
18. Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu;
19. n'ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ.
20. Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a.
21. Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n'etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a.
22. Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n'ihi na ọ dighi ntufu gādi n'etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ.
23. N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,
24. si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.
25. N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom.
26. Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti.
27. Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso;