20. kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.
21. Ọ bu n'ihi ihe ndia ka ndi-Ju jiderem n'ulo uku Chineke, we nwa ib͕um.
22. Ya mere ebe m'natara iye-aka ahu nke si n'ebe Chineke nọ puta, eguzowom rue ubọchi ta, nāgwasi madu nile ike, ma onye uku, nēkwughi ihe ọ bula kari ihe ndi-amuma na Moses kwuru na ha gaje ime;
23. na Kraist-ayi aghaghi ihu ahuhu, na Ọ gaje kwa iburu uzọ kwusara ma ndi-Ju ma ndi mba ọzọ ìhè, site na nbilite-n' ọnwu nke ndi nwuru anwu.
24. Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma.
25. Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo.
26. N'ihi na eze mara ihe bayere ihe ndia, onye m'nāgwawa kwa okwu: n'ihi na emere ka m'kweye na ọ dighi ihe ọ bula n'ihe ndia ezonariri ya; n'ihi na emeghi ihe a na nkuku.
27. Eze Agripa, ì kwere ndi-amuma? amataram na i kwere.
28. Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m'kweye ibu Kristian.
29. Pọl we si, Anamekpere Chineke ka, ma ọ bu n'iji okwu ntà ma-ọbu n'iji okwu uku, ọ bughi nání gi onwe-gi, kama ọ bu kwa ndi nile nānu olum ta, gāghọ aha madu mu onwem bu kwa, ma-ọbughi ab͕u ndia.
30. Eze we bilie, ya na onye-isi, na Banaisi, na ndi ha na ha nọduru:
31. mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, we kwurita n'etiti onwe-ha, si; Nwoke a emeghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.
32. Agripa we si Festọs, Apuru irapu nwoke a ka ọ la, ma ọ buru na ọ kpọkughi Sisa.