Ọlu Ndi-Ozi 26:16-28 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha;

17. nēweputa gi n'aka ndi-Ju, na n'aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha,

18. isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.

19. Site n'ihe ndia, eze Agripa, abughm onye nādighi-ekweye ọhù ahu nke elu-igwe:

20. kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.

21. Ọ bu n'ihi ihe ndia ka ndi-Ju jiderem n'ulo uku Chineke, we nwa ib͕um.

22. Ya mere ebe m'natara iye-aka ahu nke si n'ebe Chineke nọ puta, eguzowom rue ubọchi ta, nāgwasi madu nile ike, ma onye uku, nēkwughi ihe ọ bula kari ihe ndi-amuma na Moses kwuru na ha gaje ime;

23. na Kraist-ayi aghaghi ihu ahuhu, na Ọ gaje kwa iburu uzọ kwusara ma ndi-Ju ma ndi mba ọzọ ìhè, site na nbilite-n' ọnwu nke ndi nwuru anwu.

24. Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma.

25. Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo.

26. N'ihi na eze mara ihe bayere ihe ndia, onye m'nāgwawa kwa okwu: n'ihi na emere ka m'kweye na ọ dighi ihe ọ bula n'ihe ndia ezonariri ya; n'ihi na emeghi ihe a na nkuku.

27. Eze Agripa, ì kwere ndi-amuma? amataram na i kwere.

28. Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m'kweye ibu Kristian.

Ọlu Ndi-Ozi 26