Ọlu Ndi-Ozi 24:13-21 Bible Nso (IGBOB)

13. Ha apughi kwa igosi gi ihe ha nēbom ebubo ub͕u a.

14. Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:

15. n'ihi na enwerem olile-anya n'ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi.

16. Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.

17. Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n'iru Chineke:

18. mb͕e m'nēme ihe ndia ha hurum n'ulo uku Chineke mb͕e m'mesiri onwem ka m'di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n'Esia bia

19. ndi aghaghi inọ n'ebe a n'iru gi, na ibom ebubo, ọ buru na ha nwere ihe ọ bula imegidem.

20. Ma-ọbu ka ndia onwe-ha kwue ajọ omume ọ bula ha huru, mb͕e m'guzoro n'iru nnọkọ-ikpé-ha,

21. ma-ọbughi n'ihi otù nkpu a, nke m'tiri mb͕e m'guzoro n'etiti ha, si, Ọ bu ikpé bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu ka anēkpe mu onwem n'iru unu ta.

Ọlu Ndi-Ozi 24