14. O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta.
15. N'ihi na i gāburu Ya onye-àmà n'ebe madu nile nọ nke ihe nile i huworo nu kwa.
16. Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya.
17. O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya,
18. m'we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n'ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n'aka-gi.
19. Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù:
20. mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya.
21. O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya.
22. Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n'uwa: n'ihi na o kwesighi ka ọ di ndu.
23. Mb͕e ha nēti nkpu, nēyipu kwa uwe-ha, nēkpoli kwa àjà elu,
24. onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a.
25. Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé?