Ọlu Ndi-Ozi 21:12-28 Bible Nso (IGBOB)

12. Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem.

13. Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.

14. Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

15. Mb͕e ubọchi ndia gasiri, ayi we kwakọ ihe-ayi, rigoro Jerusalem.

16. Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n'ulo-ya dika ndi-ọbìa.

17. Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma.

18. N'ubọchi soni Pọl soro ayi bakuru Jemes; ndi-okenye nile nọ kwa n'ebe ahu.

19. Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n'otù n'otù nke Chineke lururi n'etiti ndi mba ọzọ site n'ije-ozi-ya.

20. Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:

21. eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.

22. Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo.

23. Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n'isi-ha;

24. kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.

25. Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.

26. Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha.

27. Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,

28. nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.

Ọlu Ndi-Ozi 21