20. N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia.
21. (Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.)
22. Pọl we guzo n'etiti Areọpagọs, si,Ndikom nke Atens, n'ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku.
23. N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.