5. Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume,
6. ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu:
7. n'ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma.
8. Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije.
9. Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,
10. o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.
11. Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu.
12. Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu.
13. Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.
14. Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu,
15. nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:
16. Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha.
17. Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.
18. Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.
19. Ma ndi-Ju siri n'Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n'azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu.
20. Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.