Ọlu Ndi-Ozi 13:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n'ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n'okwukwe-ayi.

9. Ma Sọl, onye anākpọ kwa Pọl, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legidere ya anya,

10. si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?

11. Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.

12. Mb͕e ahu onye-isi ahu, mb͕e ọ huru ihe meworo, o kwere, ebe ibobo ozizí nke Onye-nwe-ayi nwuru ya n'aru.

13. Pọl-hà we si na Pafọs nupu ub͕ọ, bia rue Paga di na Pamfilia: jọn we rapu ha, laghachi na Jerusalem.

Ọlu Ndi-Ozi 13