Ọlu Ndi-Ozi 1:16-20 Bible Nso (IGBOB)

16. Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.

17. N'ihi na aguru ya-ri n'etiti ayi, o we keta òkè-ya n'ije-ozi a.

18. (Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.

19. Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n'asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)

20. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si,Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu,Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na,Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.

Ọlu Ndi-Ozi 1