1. M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.
2. M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.
3. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m'we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.
4. Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.
5. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya.