Nkpughe 4:5-7 Bible Nso (IGBOB)

5. Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;

6. ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.

7. Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.

Nkpughe 4