1. M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha.
2. M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ: