1. M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha.
2. M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ:
3. ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.
4. Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.
5. Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta.
6. M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;
7. ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.
8. Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.
9. Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya,
10. ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:
11. anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.
12. N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus.