Ndi Rom 11:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di.

6. Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.

7. Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili:

8. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta.

9. Devid nāsi kwa,Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà,Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ:

10. Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ,Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.

11. Ya mere m'nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo.

Ndi Rom 11