Ndi Rom 11:27-36 Bible Nso (IGBOB)

27. Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ,Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.

28. N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà.

29. N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.

30. N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha,

31. otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a.

32. N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.

33. A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!

34. N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù?

35. ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ?

36. N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Ndi Rom 11