26. otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta;Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:
27. Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ,Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.
28. N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà.
29. N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.
30. N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha,
31. otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a.