25. N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;
26. otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta;Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:
27. Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ,Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.