Ndi Rom 11:23-32 Bible Nso (IGBOB)

23. Ndi ahu kwa, ma ọ buru na ha anọgideghi n'ekweghi-ekwe-ha, agānyakudo ha: n'ihi na Chineke puru inyakudo ha ọzọ.

24. N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha?

25. N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;

26. otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta;Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:

27. Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ,Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.

28. N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà.

29. N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.

30. N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha,

31. otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a.

32. N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.

Ndi Rom 11