Ndi-Ikpe 3:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ihud we biakute ya; ma ya onwe-ya nānọdu nání ya n'ime-ulo-elu ọjuju-oyi nke o nwere. Ihud we si, Okwu Chineke ka m'nwere igwa gi. O we si n'oche-eze-ya bilie.

21. Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya:

22. isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n'afọ-ya; o we pua n'otule-ya.

23. Ihud we pua n'uzọ-nbata, mechibido ya ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu, kpachie ha.

24. Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n'ime-ulo ọjuju-oyi ya.

25. Ha we nēche rue mb͕e ihere mere ha: ma, le, o meghepughi ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha we were nkpisi-ugodi, meghe ha: ma, le, onye-nwe-ha adawo n'ala nwua.

26. Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira.

Ndi-Ikpe 3