Ndi-Ikpe 3:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.

11. Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.

12. Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova.

13. O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu.

14. Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.

Ndi-Ikpe 3