19. Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.
20. Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n'amá.
21. O we me ka ọ ba n'ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.