Ndi-Ikpe 18:17-31 Bible Nso (IGBOB)

17. Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.

18. Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?

19. Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel?

20. Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n'etiti ndi ahu.

21. Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n'iru ha.

22. Mb͕e ndi ahu nọ n'ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n'ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan.

23. Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi?

24. Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?

25. Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n'etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi.

26. Umu Dan we je ije-ha; Maika we hu na ndi di ike ka ha bu kari ya, o we chigharia lata n'ulo-ya.

27. Ndi ahu we chiri ihe nke Maika mereri, na onye-nchu-àjà nke o nwere, ha we biakwasi Laish, biakwasi otù ndi nādi jū nānọ kwa na ntukwasi-obi, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, sure obodo ahu n'ọku.

28. Ma onye-nnaputa adighi, n'ihi na ebe di Zaidon anya ka ọ bu, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ; ebe ahu di kwa na ndagwurugwu nke di n'akuku Bet-rehob. Ha we wue obodo ahu, biri nime ya.

29. Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.

30. Umu Dan we guzoro onwe-ha arusi ahu apiri api: Jonatan, nwa Giashom, nwa Moses, ya onwe-ya na umu-ya ndikom we buru ndi-nchu-àjà diri ebo Dan rue ubọchi emere ndi ala ahu ka ha je biri n'ala ọzọ.

31. Ha we doro onwe-ha arusi apiri api nke Maika, bú nke o mere, ubọchi nile ulo Chineke di na Shailo.

Ndi-Ikpe 18