Ndi-Ikpe 1:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?

2. Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.

3. Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n'ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n'ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je.

Ndi-Ikpe 1