4. N'ihi na O kwuwo n'otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n'ubọchi nke-asa n'ọlu-Ya nile;
5. ọzọ, Ọ si kwa n'ebe a,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.
6. Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye,
7. O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,Unu emela ka obi-unu sie ike.
8. N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.
9. Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.
10. N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.
11. Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.