Ndi-Hibru 13:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile.

19. Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.

20. Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,

21. Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

22. Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.

23. Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.

24. Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu.

25. Ka amara diyere unu nile. Amen.

Ndi-Hibru 13