Ndi Galetia 6:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.

11. Lenu otú nkpuru-akwukwọ m'ji aka nkem degara unu di okpotokpo.

12. Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist.

13. N'ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n'anu-aru unu onwe-unu.

14. Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.

15. N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.

16. Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke.

17. Site n'ub͕u a ka onye ọ bula ghara isob͕um: n'ihi na mu onwem nēbu n'arum apa di iche iche nēgosi na abum onye Jisus.

18. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.

Ndi Galetia 6