6. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.
7. Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere.
8. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke.
9. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.
10. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu.
11. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim.
12. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.
13. Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.
14. Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.
15. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.