Matiu 3:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.

5. Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya;

6. ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

7. Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8. Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu;

9. unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

10. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

11. Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

12. Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

13. Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism.

14. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam?

15. Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya.

Matiu 3