29. N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
30. Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
31. Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:
32. ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu:
33. Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe.
34. Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:
35. n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;
36. ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.
37. Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?