17. onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:
18. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.
19. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.
20. Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike:
21. n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.
22. Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.