13. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
14. Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.
15. Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),
16. mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:
17. onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:
18. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.
19. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.
20. Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike: