34. Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha.
35. N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya:
36. ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya.
37. Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim.
38. Onye nānaraghi kwa obe-ya sokwam n'azu, adighi-ekwesim.
39. Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya.
40. Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma.
41. Onye nānara onye-amuma nke-ọma n'aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n'aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume.
42. Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.