Matiu 10:31-35 Bible Nso (IGBOB)

31. Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele.

32. Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.

33. Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n'iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.

34. Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha.

35. N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya:

Matiu 10