1. O we kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
2. Ma aha ndi-ozi iri na abua ahu bu ndia: Onye mbu, Saimon, onye anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya;
3. Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs;
4. Saimon Kananiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.
5. Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si,Unu ejela n'uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n'obodo ndi Sameria:
6. kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel.
7. Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso.
8. Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu.
9. Unu anatala ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu ọla itiye n'ihe-ọkiké-unu;
10. unu anatala àkpà iwere ga ije-unu, ma-ọbu uwe-ime abua, ma-ọbu akpukpọ-ukwu, ma-ọbu nkpa-n'aka: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ihe eji azù ya.
11. Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n'ebe ahu rue mb͕e unu putara.
12. Mb͕e unu nābà n'ulo ahu, kelenu ya.
13. Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ.
14. Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n'ulo ahu ma-ọbu n'obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu.
15. N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu.