3. Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.
4. Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya.
5. Ọ pughi kwa ilu ọlu di ike ọ bula n'ebe ahu, ma-ọbughi na O bikwasiri ndi-nriaria ole-na-ole aka-Ya abua, we me ka aru di ha ike.