Luk 24:37-53 Bible Nso (IGBOB)

37. Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ.

38. O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu?

39. Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere.

40. Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya.

41. Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a?

42. Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru.

43. O we nara ya, rie n'iru ha.

44. O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.

45. Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ;

46. O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ;

47. na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem.

48. Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia.

49. Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu.

50. O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha.

51. O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe.

52. Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem:

53. ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.

Luk 24