Levitikọs 6:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya.

13. Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.

14. Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà.

15. O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.

16. Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya.

17. Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.

18. Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ.

19. Jehova we gwa Moses okwu, si,

Levitikọs 6